Deuteronomy 18

Ihe nketa ndị nchụaja na ndị Livayị

1Ndị nchụaja bụ ndị Livayị, na ndị ebo Livayị niile agaghị enwe oke maọbụ ihe nketa ọbụla dịka ebo ndị ọzọ nʼIzrel. Ihe onyinye ịchụ aja niile e wetara nʼihu Onyenwe anyị site nʼọkụ bụ ihe nketa ha. 2Ha agaghị enwe ihe nketa ọbụla nʼetiti ụmụ Izrel ndị ọzọ, nʼihi na Onyenwe anyị abụrụla ihe nketa nke ha dịka o kwere ha na nkwa.

3Nke ga-abụ oke ruuru ndị nchụaja nʼebe ndị mmadụ nọ, nʼebe ndị na-achụ aja, site nʼanụ ehi maọbụ atụrụ: a ga-enye onye nchụaja ubu aka ya, agba ya abụọ na afọ ya. 4Ha ga-enwetakwa mkpụrụ mbụ nke owuwe ihe ubi unu, ya bụ, ọka mbụ unu, mmanya vaịnị ọhụrụ unu, mmanụ oliv unu na ajị mbụ a kpụchapụtara site nʼahụ igwe atụrụ unu. 5Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu ahọpụtala ebo Livayị na ụmụ ụmụ ha site nʼebo niile nke Izrel ka ha bụrụ ndị ga-eguzo jee ozi nʼihu Onyenwe anyị oge niile.

6Onye Livayị ọbụla si nʼebe o bi kwapụ gaa biri nʼobodo ọzọ nʼIzrel nwere ike ije nʼebe ịchụ aja Onyenwe anyị họpụtara, 7ọ ga-eje ozi nʼaha Onyenwe anyị bụ Chineke ya dịka ụmụnna ya ndị Livayị na-eje ozi nʼihu Onyenwe anyị. 8Ọ ga-esokwa keta oke a na-ekenye ndị Livayị bi nʼobodo ahụ, nʼagbanyeghị na ọ na-enweta ego site nʼorire e rere ihe onwunwe ezinaụlọ ya.

Ikpere arụsị

9Mgbe ị banyere nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị, amụtakwala ime omume arụ dịka ndị mba bi nʼala ahụ. 10Ka a hapụ ịchọta onye ọbụla nʼetiti gị nke na-ewere nwa ya nwoke maọbụ nwanyị nye ka a kpọọ ya ọkụ nʼihi ịchụrụ chi ndị mba ọzọ aja. Ka onye Izrel ọbụla ghara ịbụ onye na-ajụ mmụọ ase maọbụ onye mgbaasị maọbụ na-agba aja, 11maọbụ onye na-akụ mmadụ ibe ya ọgwụ, maọbụ onye na-ajụ mmụọ ọjọọ ase, maọbụ dibịa afa maọbụ onye na-ajụ ase site nʼaka ndị nwụrụ anwụ. 12Onye ọbụla na-eme ihe ndị a bụ onye Onyenwe anyị kpọrọ asị. Ọ bụkwa nʼihi ihe arụ ndị a ka Onyenwe anyị Chineke gị ji na-achụpụ ndị bi nʼala a. 13Ị ghaghị ịbụ onye zuruoke nʼụzọ niile nʼihu Onyenwe anyị Chineke gị.

Onye amụma nke ga-abịa

14Mba ndị ị na-aga inweta ala ha bụ ndị na-ajụ ase site nʼaka ndị mgbaasị na ndị na-agba aja, ma Onyenwe anyị Chineke gị anabataghị na ị ga-eme ihe dị otu ahụ. 15Kama Onyenwe anyị Chineke gị ga-eme ka onye amụma nke dị ka m biliere unu site nʼetiti unu, site nʼetiti ndị unu bụ Izrel. Ọ bụ ya ka unu ga-aṅa ntị. 16Nʼihi na nke a bụ ihe gị onwe gị rịọrọ Onyenwe anyị bụ Chineke gị nʼugwu Horeb, nʼụbọchị mkpokọta ahụ. I kwuru sị, “Anyị achọghị ịnụ olu Onyenwe anyị maọbụ hụ ọkụ ahụ dị egwu anya ọzọ, ka anyị ghara ịnwụ.”

17Nʼihi ya, Onyenwe anyị gwara m okwu sị m, “Ihe ha kwuru dị mma. 18Aga m eme ka onye amụma bilie nʼetiti ha, onye Izrel dịka gị. Aga m agwa ya ihe ọ ga-ekwu, okwu niile m tinyere nʼọnụ ya ka ọ ga-agwa ha. 19Onye ọbụla jụrụ ige ntị nʼokwu m niile nke onye amụma ga-agwa ha nʼaha m ka mụ onwe m ga-emesi ike. 20Ma onye amụma ọbụla sitere na nganga obi ya kwuo okwu nʼaha m, bụ okwu nke m na-ezighị ya ka o kwuo, ga-anwụ, maọbụ onye amụma ọbụla nke kwuru okwu nʼaha chi ndị ọzọ, onye amụma ahụ ga-anwụkwa.”

21I nwere ike ikwu nʼobi gị sị, “Olee otu anyị ga-esi mata na okwu e kwuru si nʼaka Onyenwe anyị nʼezie?” 22Otu a ka unu ga-esi mata, ọ bụrụ na ihe onye amụma buru nʼamụma nʼaha Onyenwe anyị emezughị, okwu ahụ esighị nʼebe Onyenwe anyị nọ bịa. Ọ bụ okwu onye amụma ahụ chepụtara kwuo nʼonwe ya. Unu atụla ya ụjọ.

Copyright information for IboBIU